7 Ma Ijipt, nání otù nku-ume na ihe-efu ka iye-aka-ha bu: n'ihi nka ka M'kpọworo ala nka Rehab, ndi ahu bu nkwusi.
8 Ub͕u a, bata, dekwasi ya na mbadamba íhe n'etiti ha, kà kwa ya n'akwukwọ, ka o we diri ubọchi ọdi-n'iru rue mb͕e nile ebighi-ebi.
9 N'ihi na ndi nke nānupu isi ka ọ bu, umu nēkwu okwu-ugha, umu nēkweghi inu iwu Jehova:
10 ndi siworo ndi-ọhu-uzọ, Unu agaghi-ahu uzọ; ndi siwo-kwa-ra ndi-ọhù, Unu agaghi-ahuru ayi ihe ziri ezi n'ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile, hunu ihe-ikwa-emò n'ọhù-unu:
11 Wezuganu onwe-unu n'uzọ, sinu n'okporo-uzọ wezuga onwe-unu, menu ka Onye Nsọ nke Israel kwusi iguzo n'iru ayi.
12 N'ihi nka ka Onye Nsọ nke Israel ji si otú a, N'ihi na unu juru okwu a, tukwasi obi na nmeb͕u na nsihie-uzọ, we nādabere ya;
13 n'ihi nka ajọ omume a gādiri unu ka nb͕awa nāda ada, nke nākwọputa akwọputa na mb͕idi di elu, nke ọ bu na mberede n'otù ntabi-anya ka ntipia-ya nābia.