1 Le, n'ezi omume ka otù eze gābu eze, ndi-isi kwa, n'ikpé ziri ezi ka ha gābu ndi-isi.
2 Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu.
3 Agaghi-etechi kwa anya nke ndi nāhu uzọ, nti nke ndi nānu ihe gāṅa kwa nti.
4 Obi nke ndi nēme ngwa ngwa gāghọta kwa ihe-ọmuma, ire nke ndi-nsu gēkwuwa kwa okwu ngwa ngwa.
5 Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.