6 Mma-agha Jehova juputara n'ọbara, emewo ka ọ ma abuba site n'abuba, site n'ọbara umu-aturu na nkpi, site n'abuba nke akuru ebulu: n'ihi na àjà di Jehova nwere na Bọzra, O nwe-kwa-ra oké ob͕ub͕u n'ala Edom.
7 Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.
8 N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di Jehova nwere, arọ nkwughachi diri ise-okwu Zaion.
9 Iyi-ya nile gāb͕anwe pitch, ájá-ya gāb͕anwe kwa brimstone, ala-ya gāghọ kwa pitch nēre ọku.
10 N'abali ma-ọbu n'ehihie ọ gaghi-anyu anyu; rue mb͕e ebighi-ebi ka anwuru-ọku-ya gākwugo: site n'otù ọb͕ọ rue ọb͕ọ ọzọ ọ gātọb͕ọrọ n'efu; rue mb͕e nile ebighi-ebi ọ dighi onye nāgabiga nime ya.
11 Ma okwolo na ebinta gēnweta ya; okwukwu na ugolo-ọma gēbi nime ya: Ọ gēseti kwa eriri nke itọb͕ọrọ-n'efu na nkume-ọtùtù nke itọb͕ọrọ-nkiti n'elu ya.
12 Ndi-ya amara aha-ha ka ha gākpọ inwe ala-eze, ma ọ dighi onye nọ n'ebe ahu; ndi-isi-ya nile gāghọ kwa ihe-efu.