23 Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.
24 I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.
25 Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.
26 Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu site n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ugbu a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu.
27 Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ, ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ubi ọka tutu o tolite.
28 Ma amowom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem.
29 N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.