10 Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ.Anapuwom arọm fọduru afọdu.
11 Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu:M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu.
12 Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu:Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum:Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.
13 Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile:Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.
14 Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe;Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu;Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.
15 Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya:M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.
16 Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu,Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi:I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu.