17 Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha nke-uku, bú ndi nātukwasi arusi nile apiri api obi, ndi nāsi arusi awuru awu, Unu onwe-unu bu chi-ayi.
18 Unu ndi nti chiri, nurunu; unu ndi-ìsì kwa legidenu anya, ka unu we hu uzọ.
19 Ònye kpuru ìsì, ma-ọbughi orùm, ma-ọbu ònye ka nti chiri, dika onye-ozim M'nēziga? ònye kpuru ìsì dika onye Mu na ya di n'udo, ma-ọbu ònye kpuru ìsì dika orù Jehova?
20 I huwo ọtutu ihe, ma i dighi-ariba ama; nti-ya abua ghere oghe, ma ọ dighi-anu ihe.
21 Ọ tọrọ Jehova utọ, n'ihi, ezi omume-Ya, ime ka iwu-Ya di uku, na ime ka ọ di ebube.
22 Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.
23 Ònye n'etiti unu gēge nti na nka? ònye gāṅa nti, we nu ihe n'ọdi-n'iru?