9 Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.
10 Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.
11 Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.
12 Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.
13 Jehova gāputa dika dike; dika onye-agha ka Ọ gākpọte ekworo: Ọ gēti nkpu agha, e, Ọ gēti oké nkpu agha; n'imegide ndi-iro-Ya ka Ọ nēme Onwe-ya dike.
14 Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù.
15 M'gēme ugwu na ugwu ntà ka ha kọ akọ, ihe-ọkukú-ha nile ka M'gēme kwa ka ọ kpọnwua; M'gēme kwa osimiri ka ha ghọ agwe-etiti, me kwa ka ọ̀dọ-miri nile takọ.