10 nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M'gēme:
11 nēsi n'ọwuwa-anyanwu kpọ udele, nēsi kwa n'ala di anya kpọ onye gēme ndum-ọdum: e, ekwuwom, M'gēme kwa ka o me; ezubewom, M'gēme kwa ya.
12 Genum nti, unu ndi di ike n'obi, ndi nọpuru ezi omume n'ebe di anya:
13 Ewetawom ezi omumem nso, ọ gaghi-adi n'ebe di anya, nzọputam agaghi-anọ kwa ọdù; M'we nye nzọputa nime Zaion, nye kwa Israel ima-nmam.