18 Ahuhu gādiri ndi chiri udọ̀ ihe-efu adọkpu ajọ omume, ndi ji kwa dika agāsi na ọ bu udọ̀ ub͕ọ-ala adọkpu nmehie:
19 ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara.
20 Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n'ọnọdu ìhè, na ìhè n'ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n'ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n'ọnọdu ihe ilu!
21 Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!
22 Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya:
23 ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya!
24 N'ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n'ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n'ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo.