1 Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.
2 Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike.
3 N'ihi na n'aka-nri na n'aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n'efu ka ha gēme ka madu biri nime ha.
4 Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.