3 Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu.
4 N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike:
5 M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu.
6 Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;
7 M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche.
8 Ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M'gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta.
9 Unu anu ọhia nile, bianu iri ihe, unu anu nile di n'oké ọhia.