7 o we were ya metu ọnum, si, Le, nka emetuwo eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi.
8 M'we nu olu Onye-nwe-ayi, ka ọ nāsi, Ònye ka M'gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi? M'we si, Lem; zigam.
9 O we si, Je, si ndi nka, Nānunu, ma unu aghọtala; nāhunu, ma unu amatala.
10 Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.
11 M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,
12 rue mb͕e Jehova meworo ka madu je n'ebe di anya, o we rie nne, bú ebe arapuru arapu n'etiti ala ahu.