1 N'ihi ha ọ dighi nb͕achi gādiri nwanyi nke nkpà kpara. Na mb͕e mbu O mere ka elelia ala Zebulun na ala Naftali, ma na mb͕e ikpe-azu ka O meworo ka asọpuru ya, n'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke mba nile.
2 Ndi nējeghari n'ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n'ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha.
3 I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha.
4 N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.