1 Sinu na Sela n'uzọ ọzara zigara onye nāchi ala umu-aturu, rue ugwu ada Zaion.
2 O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon.
3 Dua ọdu, menu ihe ekpere n'ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n'etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari.
4 Ka ndim achupuru achupu nọ dika ọbìa n'etiti gi; Moab, ghọrọ ya ebe nzuzo izopu ya n'iru onye nāpunara ya ihe: n'ihi na onye-nkpab͕u nwere ọgwugwu, ihe-ike agwusiwo, ndi nāzọda madu agwuchapuwo n'ala.