1 Ibu eboro Damaskọs.Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.
2 Arapuwo obodo nile nke Aroea, ìgwè di iche iche aturu ka ha gādiri, nke gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.
3 Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
4 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.
5 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye nēwe ihe ubi nēkpokọta ọka guzo ọtọ, ogwe-aka-ya anēwe oko ọka; ọ gādi kwa ka mb͕e anāchikọta oko ọka dara ada na ndagwurugwu Refaim.
6 Ma nkpuru nke fọduru itutukọ gāfọdu nime ya, dika ntisisi nke osisi olive, nkpuru abua ma-ọbu atọ n'elu ngalaba osisi kachasi elu, anọ ma ọbu ise n'alaka-ya nile, bú nke osisi nāmi nkpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta.