8 Ndi-ọkù gēze kwa ume, ndi nile ndi nātubà nko-azù nime Nail gēru kwa újú, ndi nāb͕asa ub͕u n'elu miri gāta kwa aru.
9 Ọzọ, ihere gēme ndi nālu ọlu flax etiri eti na ndi nākpa ákwà ọcha.
10 Ide-ya nile gāghọ ihe etipiara etipia, ndi nile nke nālu ọlu inara ugwọ-ọlu gābu ndi erudara eruda na nkpuru-obí.
11 Nání ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha ka ndi-isi Zoan bu; ndum-ọdu nke ndi mara ihe nime ndi-ndum-ọdu Fero aghọwo ndum-ọdu anu-ọhia: ùnu si aṅa si Fero, Nwa ndi mara ihe ka m'bu, nwa ndi-eze nke mb͕e ochie?
12 Òle ebe ha nọ kwa, bú ndi-gi ndi mara ihe? biko, ka ha gosi kwa gi; ka ha mara kwa ihe Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubeworo bayere Ijipt.
13 Ndi-isi Zoan aghọwo ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, arafuwo ndi-isi Nof; ha edufuwo Ijipt, bú ndi ahu nke bu nkume nkuku nke ebo-ya nile.
14 Jehova agwakọtawo mọ nke nb͕agọ n'etiti ya: ha we dufue Ijipt n'ọlu-ya nile ọ bula, dika onye ṅubigaworo manya ókè si akpafu n'ihe ọ b͕ọrọ.