21 N'ihi na dika n'ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya - nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya - nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu.
22 Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m'nuworo n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'elu uwa nile.
23 Genu nti, nu kwa olum; ṅanu nti, nu kwa okwu-ọnum.
24 Ọ̀ bu ubọchi nile ka onye-plough nēgwu ala igha nkpuru? ọ̀ bu ubọchi nile ka ọ nēgwughe nēme ka ala-ubi-ya di lari?
25 Ọ buru na o mewo ka iru-ya di lari, ọ̀ dighi-aghasa fitch, gha cummin, kua ọka wheat n'ahiri, gha ọka barley n'ebe akara àkà, gha ọka spelt n'ókè-ala-ya?
26 N'ihi na Chineke-ya nādọ ya aka na nti iluzi aluzi, O nēzí ya ihe.
27 N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.