1 N'ihi na, le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēsi na Jerusalem, si kwa na Juda, wezuga ihe-ndabere na nkpa-n'aka, ihe-ndabere nile, bú nri, na ihe-ndabere nile, bú miri;
2 dike, na onye-agha; na onye-ikpe, na onye-amuma, na onye nāju ase, na okenye;
3 onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri, na onye anāhu iru-ọma, na onye-ndum-ọdu, na onye mara ihe n'etiti ndi-ọ̀kà, na onye-nghọta n'irà urà.
4 M'gēwere kwa umu-okoro nye ka ha buru ndi-isi-ha, umu nāṅu ara gāchi kwa ha.
5 Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.
6 Mb͕e otù onye gējide nwa-nne-ya n'ulo nna-ya, si, I nwere uwe-nb͕okwasi, onye-ikpe ka i gāburu ayi, ka ihe-isu-ngọngọ a di kwa n'okpuru aka-gi: