5 Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.
6 N'ihi na onye-nzuzu gēkwu ihe-nzuzu, obi-ya gēme kwa ajọ ihe, ime ihe emeruru emeru, na ikwu okwu njehie megide Jehova, ime ka nkpuru-obi nke onye agu nāgu b͕ara aka, na ime ka ihe-ọṅuṅu nke onye akpiri nakpọ nku kọ ukọ.
7 Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n'ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi.
8 Ma onye amara aha-ya ezubewo ihe amara aha-ha; onye ahu nēguzosi kwa ike n'ime ihe amara aha-ha.
9 Unu ndinyom ndi nọ jū, bilienu, nurunu olum; unu umu-ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi, gēnu nti okwu-ọnum.
10 Tukwasi ubọchi ufọdu n'otù nb͕a-arọ, unu ewe me nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọghughọ-nkpuru-vine agwusiwo, nchikọta-ihe agaghi-abia.
11 Manu jijiji, unu ndinyom ndi nọ jū; menu nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: yipunu uwe, b͕ara ọtọ, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu.