1 Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.
2 Jehova, mere ayi amara; Gi ka ayi leworo anya: buru ogwe-aka-ha kwa-ututu, buru kwa nzọputa-ayi na mb͕e ahuhu.
3 Site n'olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo.
4 Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n'agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n'elu ya.
5 Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume.
6 Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya.
7 Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya.