2 Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa:
3 M'gēnye kwa gi àkù nke ọchichiri, na àkù zoro ezo nke ebe nzuzo di iche iche, ka i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye ahu Nke nākpọ gi n'aha-gi, ọbuná Chineke Israel.
4 N'ihi orùm, bú Jekob, na Israel nke M'rọputara, ka M'nākpọ gi n'aha-gi: anametu gi aha, ọ bu ezie na i maghm.
5 Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di; ma ewezuga náním ọ dighi Chineke ọ bula di: M'nēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, ọ bu ezie na i maghm:
6 ka ha we mara site n'ọwuwa anyanwu, site kwa n'Ọdida-anyanwu, na ọ dighi otù Chineke efu di ma-ọli ma ewezuga náním: Mu onwem bu Jehova, ọ dighi kwa onye ọzọ di.
7 Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.
8 Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.