1 Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.
2 Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.
3 Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu.
4 Onye-nb͕aputa-ayi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya, bú Onye Nsọ nke Israel.
5 Nọdu du, ba n'ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche.
6 Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.
7 I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.