8 Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala!
9 Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha.
10 N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.
11 Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.
12 Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.
13 N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.
14 N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya.