6 Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;
7 M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche.
8 Ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M'gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta.
9 Unu anu ọhia nile, bianu iri ihe, unu anu nile di n'oké ọhia.
10 Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.
11 Nkita-ya nile nēribiga ihe ókè, ha amaghi afọ-ojuju; ndi ahu bu kwa ndi-ọzùzù-aturu nāmaghi ighọta ihe: ha nile echewo uzọ nke aka ha iru, onye ọ bula ọ che urù-ya iru site n'akuku nile ọ bula.
12 Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.