1 O rue, n'ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya.
2 Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe.
3 Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà;
4 si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n'ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n'ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia.