21 O geru kwa, n'ubọchi ahu, na otù onye gēdebe otù nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi-ya, na nne-aturu abua nke ìgwè ewu na aturu-ya ndu;
22 ọ gēru kwa, site n'ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n'ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n'etiti ala nka gēri.
23 O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke.
24 Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n'ebe ahu; n'ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu.
25 Ma ugwu nile nke anējiri ọ́gù bọ, i gaghi-abà n'ebe ahu n'ihi egwu ogwu na uke, kama ọ gābu ebe anēziga ehi, na ebe aturu nāzọ ukwu.