11 Ma Jehova nēme ka ndi nākpab͕u Rezin nọ n'elu imegide ya, Ọ nākwali kwa ndi-iro-ya;
12 Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.
13 Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.
14 Jehova we nēbipu n'Israel isi na ọdudù, igu-nkwu na amì, n'otù ubọchi.
15 Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.
16 Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda.
17 N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.