13 Ekworo nke Efraim gēwezuga kwa onwe-ya, agēbipu kwa ndi nākpab͕u Juda: Efraim agaghi-ekwoso Juda ekworo, Juda agaghi-akpab͕u kwa Efraim.
14 Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.
15 Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.
16 Uzọ atuliri atuli gādi-kwa-ra ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria; dika o si diri Israel n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.