20 Gi na ha agaghi-abu otù n'olìlì, n'ihi na ala-gi ka i bibiworo, ndi-gi ka i b͕uworo; nkpuru nke ndi nēme ihe ọjọ, agaghi-akpọ aha-ha rue mb͕e ebighi-ebi.
21 Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n'ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n'obodo.
22 M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
23 M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ihe-nnweta nke ebinta, na ọdọ-miri ọdọ-miri; M'gewere kwa aziza, bú nkpochapu, zachapu ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
24 Jehova nke usu nile nke ndi-agha aṅuwo iyi, si, N'ezie dika M'chèworo, otú a ka ọ gādi; na dika M'zubeworo, nke ahu gēguzosi ike:
25 na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.
26 Nka bu nzube ahu nke anēzube n'elu uwa nile: nka bu kwa aka ahu nke anēseti n'aru mba nile.