17 Dika nwayi nke di ime, nke gaje imu nwa, si ab͕ali nb͕ali, tie nkpu n'aru-ufu-ya nile; otú a ka ayi diworo n'iru Gi, Jehova.
18 Ayi adiwo ime, ayi ab͕aliwo nb͕ali, ayi amuwo dika agāsi na ọ bu ifufe; ọ bughi ebe nzọputa ka ayi nēme ala; adighi-amuputa kwa ndi ganēbi n'elu-uwa dum madu bi.
19 Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.
20 Bia, ndim, bata n'ime-ulo-gí nile, mechibido uzọ-gi nile n'azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mb͕e oké iwe gāgabiga.
21 N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.