8 Ma onye amara aha-ya ezubewo ihe amara aha-ha; onye ahu nēguzosi kwa ike n'ime ihe amara aha-ha.
9 Unu ndinyom ndi nọ jū, bilienu, nurunu olum; unu umu-ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi, gēnu nti okwu-ọnum.
10 Tukwasi ubọchi ufọdu n'otù nb͕a-arọ, unu ewe me nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọghughọ-nkpuru-vine agwusiwo, nchikọta-ihe agaghi-abia.
11 Manu jijiji, unu ndinyom ndi nọ jū; menu nkpatu, unu ndinyom ndi nwere ntukwasi-obi: yipunu uwe, b͕ara ọtọ, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu.
12 N'ihi ara nile ka ha ganēti aka n'obi, n'ihi ubi nile anāchọsi ike, n'ihi osisi vine nāmi nkpuru,
13 n'ihi ala ndim, nke ogwu n'uke nēpute nime ya, e, n'elu ulo nile nke obi-utọ n'obodo nāṅuri ọṅu-agha:
14 n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;