7 Ọ̀ bu kwa onye, dika Mu onwem, nākpọ, nēgosi ya, nēdorom ya n'usoro, site na mb͕e M'doro ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga? ihe nile nke gādi n'iru, na nke gābia, ka ha gosi ha.
8 Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara.
9 Ndi n-akpu arusi apiri api, ha nile bu ihe tọb͕ọrọ n'efu; ihe nile anāchọsi nke ha agaghi-aba urù: ndi-àmà-ha kwa, ha onwe-ha adighi-ahu uzọ, ha adighi-ama kwa; ka ihere we me ha.
10 Ònye kpuworo chi, ma-ọbu wua arusi apiri api nke nābaghi urù ma-ọli?
11 Le, ihere gēme ndi ejikọtara ya na ha; ndi-ọ̀kà kwa, ha onwe-ha bu ihe zara madu: ka ha chikọta onwe-ha, ha nile, ka ha ọtọ; ha gātu oké egwu, ihere gēme ha n'otù.
12 Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà.
13 Onye-ọ̀kà n'osisi nēseti eriri; ọ nēwere pencil kà ya; o were nkpu-ya nile akpucha ya, were kwa compass-ya kà ya, o we me ya ka ọ di ka ihe-atù nwoke, dika ima-nma nke madu, ibi n'ulo.