13 N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.
14 N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya.
15 Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala:
16 ma Jehova nke usu nile nke ndi-agha di elu n'ikpé, edowo kwa Chineke, bú Onye Nsọ ahu, nsọ n'ezi omume.
17 Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n'ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba.
18 Ahuhu gādiri ndi chiri udọ̀ ihe-efu adọkpu ajọ omume, ndi ji kwa dika agāsi na ọ bu udọ̀ ub͕ọ-ala adọkpu nmehie:
19 ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara.