7 ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha.
8 Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile.
9 M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.
10 Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom.
11 Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;
12 M'gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n'ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n'anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara.
13 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu: