2 Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;
3 Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;
4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:
5 Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya;Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:
6 Ighọta ilu, na okwu miri emi;Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.
7 Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.
8 Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,Arapu-kwa-la iwu nne-gi: