Ilu 17 IGBOB

1 Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya,Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù.

2 Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere,Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.

3 Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo:Ma Onye nānwa obi bu Jehova.

4 Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe;Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.

5 Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6 Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

7 Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma:Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?

8 Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya:Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9 Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya:Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10 Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11 Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12 Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13 Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.

14 Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.

15 Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

16 N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?

17 Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

18 Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe,Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.

19 Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya:Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.

20 Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe:Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.

21 Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.

22 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.

23 Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya,Iwezuga uzọ nile nke ikpé.

24 N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di:Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.

25 Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu,Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.

26 Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma,Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.

27 Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma:Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.

28 Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe:Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31