1 Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike,N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
2 Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.
3 Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.
4 Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:Ma onye nānara onyinye nākwada ya.
5 Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.
6 Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.
7 Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.
8 Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.
9 Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.
10 Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.
11 Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.
12 Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.
13 Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.
14 Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi,Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
15 Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe:Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.
16 Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari:Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.
17 Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.
18 Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.
19 Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.
20 Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
21 Onye zutọworo orù-ya site na nwata,N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.
22 Onye-iwe nākpali ise-okwu,Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.
23 Npako madu gēme ka ọ di ala:Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.
24 Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì:Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.
25 Egwu madu nēweta ọnyà:Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.
26 Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi:Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.