Ilu 4 IGBOB

1 Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna,Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta:

2 N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu;Unu arapula iwum.

3 N'ihi na nwa ka m'buru nnam,Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem.

4 O we zím ihe, sim,Ka obi-gi jide okwum nile;Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu:

5 Nweta amam-ihe, nweta nghọta;Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:

6 Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi;Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.

7 Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe:E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.

8 Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi:Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi.

9 Ọ gēnye isi-gi okpu amara:Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka.

10 Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile;Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba.

11 N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe;Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi.

12 Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi;Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.

13 Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka:Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi.

14 Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu,Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.

15 Zere ya, agabigala nime ya;Wezugara ya onwe-gi, gabiga.

16 N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.

17 N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.

18 Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.

19 Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.

20 Nwam, ṅa nti n'okwum nile;Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.

21 Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Debe ha n'etiti obi-gi.

22 N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha,Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile.

23 Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi;N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.

24 Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ,Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ.

25 Ka anya-gi abua legide n'iru,Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi.

26 Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari,Ka edozi kwa uzọ-gi nile.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31