Ilu 28 IGBOB

1 Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha:Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.

2 N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya:Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.

3 Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike,Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.

4 Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu,Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.

5 Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé:Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.

6 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

7 Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe:Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.

8 Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa,Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

9 Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu,Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.

10 Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ,N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà:Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.

11 Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu;Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

12 Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di:Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.

13 Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya:Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.

14 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile:Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.

15 Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghariKa onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.

16 Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku,Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.

17 Madu nke ọbara madu nānyib͕u,Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.

18 Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa.

19 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.

20 Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi:Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

21 Imata iru madu n'ikpé adighi nma:Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.

22 Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.

23 Onye nābara madu nba gēmesia huta amaraKari onye nēkwu ire-utọ.

24 Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.

25 Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu:Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.

26 Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu:Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.

27 Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya:Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

28 Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya:Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31