Ilu 10 IGBOB

1 Ilu di iche iche nke Solomon.Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.

2 Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù:Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.

3 Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume:Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu.

4 Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu:Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

5 Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche:Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.

6 Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume:Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

7 Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi:Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.

8 Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

9 Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi:Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.

10 Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

11 Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

12 Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche:Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.

13 N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe:Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.

14 Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma:Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.

15 Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike:Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.

16 Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu;Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.

17 Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu:Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.

18 Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha;Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.

19 N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi:Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.

20 Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu:Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà.

21 Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu:Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.

22 Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya,Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.

23 Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ:Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.

24 Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya:Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha.

25 Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa:Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.

26 Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di,Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ.

27 Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu:Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu.

28 Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù:Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.

29 Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu;Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ.

30 Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi:Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.

31 Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru:Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya.

32 Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ:Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31