Ilu 5 IGBOB

1 Nwam, ṅa nti n'amam-ihem;Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:

2 Ka i we debe ìzùzù di iche iche,Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.

3 N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu,Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:

4 Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood,Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.

5 Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu;Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;

6 Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari:Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.

7 Ma ub͕u a, umum, gēnum nti,Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.

8 Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ,Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:

9 Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi,Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:

10 Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi;Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;

11 I we sua udè n'ikpe-azu-gi,Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,

12 I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;

13 Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim,Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!

14 Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nileN'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.

15 Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi,Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.

16 Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí?Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?

17 Ka ha diri nání gi onwe-gi,Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.

18 Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi;Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.

19 Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma,Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile;Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.

20 Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam?N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?

21 N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di,Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.

22 Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu,Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31