Ilu 25 IGBOB

1 Ndia bu kwa ilu Solomon turu, nke ndi Hezekaia, bú eze Juda, deputara n'akwukwọ.

2 Ọ bu nsọpuru Chineke izobe okwu:Ma nsọpuru ndi-eze bu igwuputa ala okwu.

3 Elu-igwe n'idi-elu-ya, na ala n'omimi-ya,Na obi ndi-eze, ọ dighi ngwuputa di ha.

4 Wepu afuru-uzu n'ọla-ọcha,Ihe ewe putara onye nānucha ọla:

5 Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze,Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume.

6 Asọpurula onwe-gi n'iru eze,Eguzo-kwa-la n'ọnọdu ndi uku:

7 N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a;Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya,Onye anya-gi abua huworo.

8 Apula ngwa ngwa ise okwu,Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya,Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.

9 Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi,Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:

10 Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi,Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi.

11 Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọchaKa okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.

12 Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọmaKa onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.

13 Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi,Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya;Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.

14 Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.

15 Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.

16 Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.

17 Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi;Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.

18 Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọKa onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.

19 Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapuKa itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.

20 Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.

21 Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:

22 N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,Jehova gākwughachi kwa gi.

23 Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.

24 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

25 Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà,Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di.

26 Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibiKa onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.

27 Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma:Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.

28 Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighiKa onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31