Ilu 9 IGBOB

1 Amam-ihe ewuwo ulo-ya,Ọ waputawo ogidi asa ya:

2 O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa;O dowo kwa table-ya n'usoro.

3 O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkùN'elu ebe nile di elu nke obodo, si,

4 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya,

5 Bianu, rienu nrim ufọdu,Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa.

6 Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu;Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.

7 Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì:Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.

8 Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì:Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.

9 Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari:Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.

10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu:Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta.

11 N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba,Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu.

12 Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe:Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.

13 Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu;Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula.

14 Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya,N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo,

15 Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù,Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha,

16 Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya,

17 Miri ezutara ezuta nātọ utọ,Nri eriri na nzuzo di utọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31