Ilu 15 IGBOB

1 Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu:Ma okwu nwuta nākpali iwe.

2 Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma:Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

3 N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di,Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.

4 Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu:Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.

5 Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya:Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche.

6 N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di:Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di.

7 Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma:Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.

8 Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova:Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.

9 Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu:Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.

10 Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ:Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.

11 Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova?Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?

12 Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba:Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.

13 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma:Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu.

14 Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma:Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.

15 Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ:Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.

16 Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova,Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.

17 Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu,Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.

18 Onye-ọnuma nākpali ise-okwu:Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.

19 Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu:Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.

20 Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.

21 Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù:Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

22 Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh:Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.

23 Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya:Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!

24 Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ,Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.

25 Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu:Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

26 Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu:Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.

27 Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu:Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu.

28 Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu:Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.

29 Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ:Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.

30 Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria:Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba.

31 Nti nke nānu iba-nba nke ndu,N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali.

32 Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya:Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.

33 Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe;Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31