Ilu 21 IGBOB

1 Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova:N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.

2 Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua:Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.

3 Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpeBu ihe Jehova nārọputa kari àjà.

4 Anya npako na obi di nganga,Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.

5 Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù:Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

6 Ikpa àkù site n'ire okwu-ughaBu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.

7 Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha;N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.

8 Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu:Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.

9 Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

10 Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.

11 Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe:Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.

12 Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu;Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.

13 Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

14 Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.

15 Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe;Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.

16 Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu,Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.

17 Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu:Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.

18 Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.

19 Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara,Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.

20 Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe;Ma madu nzuzu nēloda ya.

21 Onye nāb͕aso ezi omume na ebereNāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.

22 Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo,O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.

23 Onye nēdebe ọnu-ya na ire-yaNēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.

24 Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya,Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.

25 Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua;N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.

26 Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku:Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.

27 Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú:O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?

28 Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì:Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.

29 Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike:Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.

30 Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di,Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.

31 Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha:Ma Jehova nwe nzọputa.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31