Ilu 8 IGBOB

1 Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù?Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?

2 N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ,N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;

3 N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo,Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,

4 Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku;Olum nādaku kwa umu madu.

5 Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche;Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.

6 Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu;Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.

7 N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche;Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.

8 N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di;Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.

9 Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ,Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.

10 Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha;Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.

11 N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby;Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.

12 Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim,Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.

13 Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì:Npako, na nganga, na uzo ọjọ,Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.

14 Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe:Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.

15 Mu ka ndi-eze ji abu eze,Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.

16 Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi,Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.

17 Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya;Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.

18 Àkù na nsọpuru di n'akam;E, àkù nke nādigide na ezi omume.

19 Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.

20 N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:

21 Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.

22 Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.

23 Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu,Tutu uwa adi.

24 Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.

25 Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala,Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:

26 Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo,Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.

27 Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ:Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri:

28 Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu:Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:

29 Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya,Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya:Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:

30 Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà:M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi,Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;

31 Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya;Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.

32 Ma ub͕u a, umum, genum nti:N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.

33 Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe,Unu eze-kwa-la ya ndu.

34 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu,N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi,Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.

35 N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31