Ilu 26 IGBOB

1 Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi,Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.

2 Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya,Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.

3 Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.

4 Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.

5 Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.

6 Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miriKa onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.

7 Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.

8 Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9 Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.

10 Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

11 Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.

12 Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;Ọdum di n'amá.

14 Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya,Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.

15 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa;Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.

16 Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.

17 Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.

18 Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,Na àkú, na ọnwu;

19 Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?

20 Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.

21 Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di;Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.

22 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

23 Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọchaKa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.

24 Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua,Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:

25 Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya;N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.

26 Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya,Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.

27 Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà:Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.

28 Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì;Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31