Ilu 22 IGBOB

1 Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù,Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo.

2 Ọgaranya na ob͕eye ezutewo:Onye meworo ha nile bu Jehova.

3 Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

4 Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu JehovaBu àkù, na nsọpuru, na ndu.

5 Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya.

6 Zulite nwata dika uzọ-ya si di,Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.

7 Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

8 Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.

9 Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

10 Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.

11 Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.

12 Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.

13 Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí:N'etiti amá ka agēb͕um.

14 Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.

15 Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.

16 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.

17 Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.

18 N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi,Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.

19 Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na JehovaKa m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.

20 Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;

21 Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?

22 Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:

23 N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.

24 Gi na onye-iwe abula eyì;I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:

25 Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.

26 Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.

27 Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ,N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi?

28 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi,Nke nna-gi-hà kpaworo.

29 Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya;Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31