Ilu 3 IGBOB

1 Nwam, echezọla iwum;Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:

2 N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu,Na udo, ka ha gātukwasiri gi.

3 Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi:Ke ha n'olu-gi;De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:

4 Chọta kwa amara na ezi ucheN'anya Chineke na madu.

5 Tukwasi Jehova obi-gi nile,Adabere-kwa-la nghọta-gi:

6 N'uzọ-gi nile mara Ya,Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

7 Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi;Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:

8 Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi,Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.

9 Sọpuru Jehova site n'àkù-gi,Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:

10 Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ,Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

11 Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:

12 N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

13 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,Ya na madu nke nēnweputa nghọta.

14 N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.

15 Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.

16 Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.

17 Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.

18 Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.

19 Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.

20 Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.

21 Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22 Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23 Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25 Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26 N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27 Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

28 Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.

29 Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.

30 Gi na madu esela okwu n'efu,Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.

31 Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.

32 N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.

33 Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu;Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.

34 Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.

35 Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa;Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31