Ilu 7 IGBOB

1 Nwam, debe okwu-ọnum nile,Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ.

2 Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu,Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi.

3 Ke ha na nkpisi-aka-gi nile;De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi.

4 Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu;Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma:

5 Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi,N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ.

6 N'ihi na na window nke ulomN'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya;

7 M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche,M'mata n'etiti umu-ndikom,Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ,

8 Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu,Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;

9 Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi,Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri.

10 Ma, le, otù nwanyi zutere yaYiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.

11 Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya;Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ:

12 Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile,Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.

13 Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu,Were iru ihere nādighi si ya:

14 Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam;Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.

15 N'ihi nka ka m'putara izute gi,Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.

16 Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina,Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.

17 Ewerewom myrrh na aloes na cinnamonFesa ihe-ndinam.

18 Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu;Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.

19 N'ihi na dim anọghi n'ulo,O jewo ije di anya:

20 Ọ werewo akpa ego n'aka-ya;N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.

21 O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya,O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.

22 Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede,Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya,Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya;

23 Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya;Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu,Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.

24 Ma ub͕u a, umum, genum nti,Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum.

25 Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n'uzọ nile nke nwanyi ahu,Akpafula n'okporo-uzọ-ya nile.

26 N'ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da:E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31